Oji bu isi omume

Nwa afo Igbo amaghi onodu oji na emume ndi Igbo, achitaghi aja ma otu. Ndi Igbo ji oji ebido emume nile. Oji bu isi omume ndi Igbo. Oji di ndi Igbo oke mkpa maka a si na onye wetara oji wetara ndu!. Unu makwa na ndu bu isi.

Ka chineke gozie umu Igbo nile ma tukwasara anyi ndu n’elu ndu. Taa nu oji. Ndewonu.

Advertisements

Otu afo n’ime obi m

Onye abu nne m, Odogwu nwanyi ka anyi na akpo ya. O lakwurula Chineke n’ elu igwe. Ana m echeta ya mgbe nile. Umu nne onwu siri ike! Echi gara aga mere ya otu afo o zuru ike na mkpagbu nile nke ajo uwa a

Nwanyieze ,Nwanyi ka dike, Nne ma obi nwa ya, Odogwu na nwanyi, Nwanyi ka ibe ya, Nwanyi kwuru, ebube adi, mma zuru Nwanyi, Nwanyi ekere huru kwe ekele, Igolo nani ya tozuru , Udo diri gi mgbe nile. Ebeguona m olu!

Afo Ohu nnoo

Ka afo too anyi ka ji na mmanu…2018 bu afo ndi mma.O ga ehichapu anyi anya mmiri afo ndi gara aga.Na enwe nu anuri.Udo

Biafra:Igbo o di njikere?

Anyi choro Biafra!Anyi choro nwere onwe!Anyi choro nketa mara anyi aka! I si m kwuo,ochicho ndi a magburu onwe ha kama ajuju m bu,anyi bu ndi Igbo o di njikere i nwere onwe anyi?A si kwanu na anyi di njikere,kedu ihe mere ihe isi ike ji karia n’ala Igbo.Kedu ihe kpatara ndi ndu anyi ka ha bu ndi ochichi n’ala Igbo ji adola anyi nani azu?Unwu,umu npiapia oria,ori,ito mmadu,aka azu na kwa mpu di iche iche juputara n’ala Igbo nile.O bu naani mgbe Biafra biara ka anyi ga amuta ihe di mma na ihe kwesiri ekwesi.

N’eziokwu,eweli kwara m nwa nwoke a na akpo Nnamdi Kalu aka elu ka o si kwuru chim,nogidesiekwa ike na okwukwe Biafra ya.O nweghi ihe di njo na mmadu ma o bu otu ndi choro ihe nketa ha.O maka nu mana a ga esi ebe nweta ndi ga edu Biafra ka o bu nno aha anyi gbanwe,anyi agbanwe kwa?

N’ezie ekewapuru ndi Igbo n’otutu ihe na obodo Naijeria mana o bu nani mgbe ndi Igbo nwere ihunanya na idi n’otu ka anyi ga enwere onwe anyi n’ezie.Ndi ndu anyi bu nsogbu anyi nwere na ala Igbo,hoha!Ndi Igbo tetanu n’ura!