I di n’otu

Igbo nmanma nu ooo. Umunne m biko nu,ka anyi tinyetu kwanu onu n’ihe gbasara idi n’otu n’ala Igbo.I legharia anya n’ala Igbo,o ga edo gi anya na idi n’otu,udo na otu obi agbafuola na ala Igbo. Oge m di na nwata,anyi na akpaghari  ka o siri masi anyi n’ime obodo.I banye n’ulo onye agbata obi gi,i rijuoro onwe gi afo,dina ala rahu ura ma icho,gi na umuaka ibe gi egwuria egwu,gba egwu onwa,uwa wee na aga siriri werere.

Mana egwu agbanwela,n’eziokwu enweghi m ike izoro ukwu banye n’ulo onye agbata obi m dika n’mbu,nodu ala,nuo mmiri ma o bu rie nri.Ihe nke a jogburu onwe ya.Oke ihe ojoo abatala n’etiti anyi.I ga anu akuko di iche iche i nweghi ike ikwu chi m na ala kpaa isi okwu ha mana akuko ndi a bu ya wetara iro n’etiti ndi Igbo.Otutu ihe emebiela,okenye enweghi kwa ike i bara nwatakiri mba nkiti,i nweghi di ike ikele ekele,ahapu iko ka amusu si ,si na ekele gi ahu aru oru ya.Ihe nke a juru m anya,tuo m n’anya mana na agbowa m obi. Onodu anyi adighi nma ma otu.Kedu ihe emere ihe nke a umunnne m.Biko gi nwa afo Igbo tinye onu na okwu a ka anyi choputa ogwu oria nke a na acho ikpochapu mba Igbo nile.

Onye ma ihe anyi nwere ike ime i ji gbanwee o biara ohuu nke a ,biko kowaputara anyi n’ebe a.Igbo ndi nwe mmadu,o gwucha kwa ka o ha m n’onu.Ndeewonu!

Advertisements

About ojy

A bu m odee na ihe edemede nile ma buru kwa nwa afo Igbo tozuru etozu. (I am a versatile writer,a poet and an Igbo woman indeed!)

2 responses to “I di n’otu

  1. Nneoma Kaycee

    Na-eziokwu,obodo anyi emebiela,o dikwaghi nu mu mma na -obi.
    Ufodu ebighi na-udo na adighi na otu bucha aka oru Ndi amuma ugha. Ndi na-ekwu Mgbe odighį ihe ha ahuru,įsi ka mu kwue,o socha na-ihe mebiri nriko na ndiko na-otu umunne.
    Enwekwara ihe Ndi ozo,mana ka obere m etu a na ônû. Ndeewonu umunnem

    Like

Leave a Reply

Fill in your details below or click an icon to log in:

WordPress.com Logo

You are commenting using your WordPress.com account. Log Out / Change )

Twitter picture

You are commenting using your Twitter account. Log Out / Change )

Facebook photo

You are commenting using your Facebook account. Log Out / Change )

Google+ photo

You are commenting using your Google+ account. Log Out / Change )

Connecting to %s

%d bloggers like this: