Igbo enweghi eze!

Igbo enweghi eze bu okwu mpako,hoha!.Mpako bu mmadu i buli onwe ya elu.Mpako na ebute i leda mmadu ibe gi anya ma o bu kwanu i kpo mmadu ibe gi ihe efu.Ozo,mpako na ebute oke ochicho i ji zaa o chiri ozuo. Nke a jogburu onwe ya.I lee anya na ala Igbo taa,i ga ahu na otutu umu okorobia na umu agboghobia anyi e jila ndu o loro ohuru ,”i dika ibe” wee tinye onwe ha n’onodu nmekpa ahu kariri akari.

A si na Igbo enweghi eze,nke o kwesiri i butara anyi afo ojuju ka o bu ndu ihe efu.I si na otu ndi enweghi eze na achikota ha,n’uche aka m,abughi ezi ihe.Site na mbu ka eze ji wee diri na uwa.O dika ezi n’ulo enweghi nne na nna ma o bu otu na enweghi onye isi,otu o bula i siri tulee ya,o dighi mma.Mba o bula kwesiri inwe onye nchikota,onye isi,onye ndi obodo na egere nti.o bu kwa nu ihe itunanya na Igbo nile enweghi otu olu?Onye o bula bu eze nke aka ya. Mpako we buru usoro ndu ndi Igbo,na aza eze onye agwala m okwu. Bikonu Igbo ndi oma,o ruola mgbe anyi ga eleba anya n’okwu a.Usoro a adighi mma.

Ndi Igbo bu kwanu ndi agoziri agozi,ndi Chineke choro mma puru iche,ndi amamihe zuru ahu,mana anyi ewerela oke mpako wee mebie onyinye amara nile Chineke nyere anyi.Akwukwo nso gwara anyi si:O buru n’iweda onwe gi ala,Chineke ga ebuli gi elu.Ozo kwa;Iwe Chineke nokwasiri n’ahu ndi mpako.O ga abu na iwe Chineke di oku n’ebe ndi Igbo no?Amaghi m asisa ajuju a mana ihe m ma bu na o buru na anyi ewetuo onwe anyi na ala,Chineke ga ebuli anyi elu.Ndi Igbo bu kwanu uburu na igwe ji oganihu na aku  Naijiria. Mpako emela ka umu Igbo na amanye aka n’ihe ojoo digasi iche iche.I lee na ndi na ebu ogwu iwu obodo megidere,ndi na emeputa mmanya na umu ihe ndi ozo na enweghi ihu,o bu ndi Igbo,ndi ntoo mmadu,ndi ogwu ego,ndi akwuna,ndi na ere umu amuru ohuu,o busi ndi igbo kwu n’azu ihe ojoo nile a.

Ndi Igbo wepunu aka enwe n’ofe tupu o gho aka mmadu.Ka anyi werenu onyinye amamihe anyi mee ezi ihe.Ufodu umu Igbo no n’Aba na agba mbo imeputa otutu ihe ndi di mma dika uwe,akpo ukwu na ihe ndi ozo.Ndi Igbo na agba mbo.Ka anyi gbanu ezi mbo,ju ekwensu na olu ya nile.O cho ihe ukwu ga anya aba enyi!Okuko nti ike ga anu ihe n’ite ofe. Chetakwanu na mpako buru uzo,odida esoro ya.Udo diri unu!

Advertisements

About ojy

A bu m odee na ihe edemede nile ma buru kwa nwa afo Igbo tozuru etozu. (I am a versatile writer,a poet and an Igbo woman indeed!)

Leave a Reply

Fill in your details below or click an icon to log in:

WordPress.com Logo

You are commenting using your WordPress.com account. Log Out / Change )

Twitter picture

You are commenting using your Twitter account. Log Out / Change )

Facebook photo

You are commenting using your Facebook account. Log Out / Change )

Google+ photo

You are commenting using your Google+ account. Log Out / Change )

Connecting to %s

%d bloggers like this: