Aha Igbo na omimi ha

Chiboanuozo!,Agamdodaigwe!,Ozoemena!,Ositadinma!Akobundu!,Igwebuike!

Ihuoma!,Ojinika!. Ihe  nile a bu aha ndi Igbo na aza.Aha ndi a nwere nkowa

di omimi.A ma m na mba nile nwere aha ha na agu umu ha ma na uche aka m,

aha ndi Igbo dikarisiri omimi,tumadi aha ndi gboo zara dika ufodu n’ime ndi m deputara.O bu kwa eziokwu na oge gara aga,ndi Igbo na enye umu ha aha

ubochi amuru ha dika Okonkwo,Mgbonkwo,Afor,Okereke,Orieji dgz. Ndi Igbo

na agunyere otu izu, mkpuru ubochi ano dika ahia ndi Igbo si azu ma rue taa.

Ka oge gasiri,aha ndi a bidoro gbanwewa,ndi Igbo ejighi kwa ike agu umu ha

aha ndi ahu e ji aha ahia akpo.Aha ufodu ebidoziri  na agu umuaka bu; Ogechukwu,chikodinaka,Daberechi,Chukwuemeka,Chinyere,Ngozichukwu,

Chukwudi,Eberechukwu,Chioma,Chinenyenwa,Kelechi dgz.  Aha ndi a mara

mma ma nwekwa nkowa di omimi.O doro anya na otutu ndi Igbo makuru Chukwu,legide ya anya dika onye na enye nwa. Mana i lee anya na ubochi

taa,i ga ahu na ndi Igbo na agu umu anyi aha m ga akpo aha ohuu di omimi

ma gosikwa nlekwasi anya n’Chineke,too uto n’onu ma da kwa ezigbo uda

n’nti dika :

Sochikanyima (Sochikaima)

Somtochukwu (Somto)

Chifurumnanya (Fumnanya)

Lenmachimnyerem (Lenma)

Nmasinachi (Nmasi)

Aha kariri mana ndi a ka m chetara.O buru na o nwere ndi nke i ma,biko

dee ha ka anyi muru na ihe oma amaka. Ndewonu!

Advertisements

About ojy

A bu m odee na ihe edemede nile ma buru kwa nwa afo Igbo tozuru etozu. (I am a versatile writer,a poet and an Igbo woman indeed!)

Leave a Reply

Fill in your details below or click an icon to log in:

WordPress.com Logo

You are commenting using your WordPress.com account. Log Out / Change )

Twitter picture

You are commenting using your Twitter account. Log Out / Change )

Facebook photo

You are commenting using your Facebook account. Log Out / Change )

Google+ photo

You are commenting using your Google+ account. Log Out / Change )

Connecting to %s

%d bloggers like this: