Nyere ndi ozo aka

Igbo ndi oma,ndewonu!. Ihe na eme na obodo Naijeria na agbagwoju anya nkw ukwu,akuko ka e si gbaa nwa nnunnu,nne ya efe,umunne o gwuru ike.Kama,asi m egbe bere ugo bere,nke si ibe ya ebela,biko nku kwakapu ya n’ike.

Nani akuko ndi mmadu kpu no onu ugbu a bu nke ihe isi ike.O kwa unu anula na ego ndi ogaranya mmadu ise nwere na Naijeria ezuola,ikpochapu ubiam n’ndu mmadu  otu nari,iri na abuo nde.I ba n’ime ahia,ihe i zuru izu uka gara aga etinyela ego.M wee na aju si,o bu gini kpatara onodu ojoo nke a n’obodo anyi.Umu mmadu enweghi kwa ike izuta ezigbo nri,o bu na di garri bu kwa zi nri ndi ogaranya,anu okuko,ji,osikapa,agwa ga a bu nno nri nani ndi eze ga na eri,ma o buru na ihe agbanweghi na atufughi oge.

Onye nwere nke o nwere nyere nwanne ya aka.Onye nwere mmiri biko gbanyere onye agbata obi gi ahu nwere iko ma o nweghi mmiri.Ka anyi leta ndi na enweghi ndi inye aka,ndi agadi,umu nwanyi ajadu,umuaka na enweghi nne ma o bu nna,ndi uwa na atu n’onu.O nweghi kwanu ihe eji uwa a eme.Ka Chineke onye ebere,na agba anyi ume ma were kwa ihe oma nile ji cho anyi mma n’aha Jisos Kristi,Amin.

Advertisements

About ojy

A bu m odee na ihe edemede nile ma buru kwa nwa afo Igbo tozuru etozu. (I am a versatile writer,a poet and an Igbo woman indeed!)

Leave a Reply

Fill in your details below or click an icon to log in:

WordPress.com Logo

You are commenting using your WordPress.com account. Log Out / Change )

Twitter picture

You are commenting using your Twitter account. Log Out / Change )

Facebook photo

You are commenting using your Facebook account. Log Out / Change )

Google+ photo

You are commenting using your Google+ account. Log Out / Change )

Connecting to %s

%d bloggers like this: