Nma! (Beauty!)

 

Kpo ya opuru iche,ihe efu  (Call it unique,call it vain)

Were ndi Muo ozi tunyere ya,  (Liken it to angels)

Kpo ya ihe di oke onu,ihe na agafenari   (Call it higly prized, call it fleeting)

Were kwa eke nile tunyere ya   (Liken it to nature)

Nma di nno ebube    (Beauty is simply divine)

O kariri ihe eji anya ahu   (It is beyond the physical)

O di ezigbo omimi mana nwekwa ihu   (It is strictly deep yet visible)

O na enye ma onwe ya,nwekwa ihunanya (It is giving,selfless ,loving)

Ezigbo nma bu nke si n’mkpuru obi   (True beauty is of the heart)

Nma bu nke eziokwu di ebube      (True beauty is divine!)

O buru na ala anyi ga aburu anyi ebe obibi n’ezie  (If our land will indeed be a place worth living)

Ka anyi na azu nma nke a          (Let us nurture this beauty)

N’ihi na o bi n’ime anyi       (For it dwells within us)

Omumu

Omumu bu onyinye chukwu,o sighi aka mmadu abia.Ihe kpatara m ji ede maka omumu taa bu ihi akuko otu nwata nwanyi koro m ugbu a,onye di ya na umunne di ya chupuru n’ulo n’ihi amutaghi nwa ka afo isii gachara e ji luta ya.A huru m ya n’ulo ogwu ebe m gara i leta enyi m nwanyi muru nwa ohuu.

Ya na enyi m nwanyi ahu no n otu ime ulo. Oge m kpewara ekpere ikele chineke onye nani ya na enye nwa,o sonyere anyi na ekpere mana na ebe akwa. Agbaliri m kpecha ekpere ma gaa n’ihu iju ya ihe kpatara o ji ebe udi akwa nke a ebe o kwesiri i na anuri.O si mu hapu ya ka ya bee akwa n’ihi na o bughizi akwa ariri ma o bu nke obi ngbowa na o bu akwa onu na obi oma.O gwara m na ya luru di mbu ya afo asato gara aga wee no n’ulo di ya afo isii na atughi ime ma oli.O kwuru na ya gara ulo ogwu nile ama ama n’obodo ha bi ma onweghi dokinta choputara ihe o bula ga egbochi ya amula nwa. Kama o gwakwara m na di ya agaghi ule ahu nke ya.O kwuru na di ya si na ahu zuru ya oke,na ya atuola otutu umu nwanyi ime,ya mere o nweghi ka o buru ya kpatara amughi nwa ha.Ka ihe ndi a nile na aga,umunne di ya wee buru agha so ya,na akwa ya emo kwa ubochi,kpo ya akwuna,ko ya onu ka o si wepu akpa nwa ya,kpo ya nwoke no n’udi nwanyi.O koro m ka ya si lota uka otu ubochi wee hu akpati ya nile n’ ezi ebe mmiri na ama ha.O kporo papa ya n’ekwe nti,o wee dunye nwanne ya nwoke ka o bia bulata ya ulo.Otu a ka alu m di na nwunye ya na di ya ji gbasaa.
O kwuru na o di ya ka uwa ya o bidoro n’isi mgbe ahu.Di ya wee lugharia nwunye ozo,olileanya nile ya nwere ilaghachi wee bie oge o nuru maka ya.O si na ya hapuru obodo ahu,we nweta oru n’obodo ozo,ebe ya no we hu nwoke ya na alu ugbu a.Nani onwa abuo ka ya na di ya biri tupu o turu ime wee muo umu ejima,nwoke na nwanyi.O si na ya nuru na di ya na nwunye ohuru ya ka na acho nwa.

Ihe nke a riri m onu,ju m anya mana ekele kwara m Chineke onye nani ya na enye nwa. Onye ka o di kpatara amughi nwa ha. Onye o soro ya buru,nke m bu onye ejila ihe mere mmadu ako ya onu. Ndi Igbo bikonu onye ejila onodu amughi nwa ako mmadu onu.#Onyemaechi .#Onyebuchibeya.#Chinenyenwa. #Uwaezuoke. #Nwabuonyinyechukwu.

Ilu Igbo

Ilu,Ilulu?Kedu ihe unu na akpo ya na obodo unu? Mama m na atu ilu nke ukwu.O nweghi ihe o naghi atunyere ilu.O si na ya siri na aka nna ya muta itu ilu.O nwere ndi o ga abu o tuo ha,echebara m ha ezigbo echiche.Ilu Igbo dikwanu omimi i gwa gi ezi okwu.Ka m tuoro unu ndi nke m chetara.I nwe ike kowa ya ka anyi mara ma i ghotara ha.Ma chetakwa na ala Igbo asi na onye aturu ilu ma kowara ya ilu ahu,bu onye ego e ji luo mama ya lara n’ihi. ochi atogbu m o .

  1. Onye a si leruo anya n’ala,asighi ya wuru mkpuru anya ya wusa n’ala
  2. Ukwa rue oge ya,o daa
  3. Iwe nwanne anaghi eru n’okpukpu
  4. Eze ana aria aria biakwara juo akwu ure
  5. Nkiti anaghi agba ihe ya
  6. Otu onye anaghi aza nnaoha
  7. A sokata eze anya, e kpuru nkata n’isi gwa ya okwu
  8. A nyukota nmamiri onu,o gbaa ufufu
  9.  E gbukota cha ahu,ahu na afo kwa
  10. A naghi asa nkiti okwu

Dee nke gi ma o bu gbalia kowa nke m dere ebe a

Igbo amaka umunne m…

Onwa ohuru

nov

Taa bu mbido onwa ohu

Onwa Novemba nno!

Mee onwa a ka o puoro gi iche
N’agbanyeghi ubochi ojoo
ma o bu obi ojoo onodu obodo anyi
na ewatara anyi nile ugbu a
Kwuwa isi gi oto
mee onwe gi obi anuri
Nani onye di ndu ga echekwanu banyere echi
Taa bu ncheta omumu ada m nwanyi
Obi bu m so anuri
Ekele nile diri Chineke onye na enye omumu
A na m ario kwa ya ka o zaa di na nwunye nile
na ele anya ya maka mkpuru nke afo.
Unu ga aturu,unu ga ekuru n’aha Jisos.Amen
Igbo amaka.

Biko suo nu Igbo

Ihe m ji ede maka asusu taa bu maka ihe m gutara na intaneti ,ebe otu onye dere na umu mba Africa nile ga agba mbo hu na ha kewaputara onwe ha n’ihe nile gbasara asusu na e jiri mara anyi.Ihe nke a gbawara m obi.Ndumodu ya bu ka anyi gbakwuru agba ohuru na mmuta ipia aka n’igwe,na nke a ga egbochi ila azu n’obodo Africa.M wee na ajuzi si;O putara na asusu anyi na ewela anyi azu?Ka o bu na asusu anyi adighi mma,o na eme anyi ihere?Biko umunne m zaa nu m ajuju ndi a maka ya bu ihe gbagwojuru m anya nke ukwuu.

A na m eche na nani ndi Igbo ka asusu ha na eme ihere,i nu ya ebe o metutara mba Africa nile,gbara m gharii.Na agbanyeghi nke a,ebe isi okwu m ga ejide aka bu na asusu Igbo. Igbo bu Igbo,e ji kwanu m asusu m anya isi. A bu m nwa afo Igbo. E ji m ohere o bula nwetara atapia Igbo.O na ato m uto n’ onu. Nke bu na aghotaghi m ihe otutu nne na nna bu ndi Igbo ji ahapu asusu Igbo suwara umu ha asusu bekee.Asusu bekee o bu asusu gi?.Kedu ihe kpatara i ji anapu umuaka oke ruru ha aka. Ghota kwa nu na asusu onye bu ugwu ya,buru kwa e jiri mara ya.Ihe mere ndi nne na nna ga e ji keghapu umu n’udi oke a ekweghi m nghota.

O di ezigbo mkpa,na ndi nne na nna,ndi nkuzi,ndi okenye na ndi nile na elekota umuaka anya ga agba mbo hu na umu ha mutara asusu Igbo n’agbanyeghi ebe onye no.O nweghi ebe anaghi asu Igbo.Bido kuziwere umu unu A B CH D….Zuta kwa Akwukwo Nso Igbo ka umuaka na agu.Ihe ndi a di oke mkpa.I nwere ike inye umu gi  onyinye, akwukwo Igbo di iche iche n’ ubochi ncheta omumu ha.Kpolata ha ala Igbo ka umuaka mata ndi ikwu n’ibe ha.E jiri mara di mkpa nke ukwu. Ekewapula umu gi oke ha.

Ndi intaneti ga asi “who langauge epp?” HAHAHAHA…ehhh! Bikonu hapu ndi o so chi egbu. O nweghi onye uwa zuru oke,kama nke i nwere ike ya, i mee.O buru na i ma Igbo asu,kedu ihe mere nwa gi agaghi ama Igbo asu?.A si na ekwughi ekwu mere onu.

Igbo ndi oma,bikonu onye aghala nwanne ya.Ka anyi na akwado asusu Igbo.Anyi bu ndi oma. Biko suo nu Igbo. Udo diri unu.

Igbo teta nu n’ura

Igbo bu Igbo a na m ekele unu,ndu mmiri,ndu azu.Ka ihe oma na agbaso anyi mgbe nile na aha Jisos.

Umunne m,unu ga ekweta na Igbo nwere mmadu,I lee anya,I ga ahu otutu ndi Igbo di iche iche nogasi ebe di iche iche na emegba anyi ihu.Igbo enweghi ndi ume ngwu,i gba mbo bu ejiri mara ndi Igbo.Ndi Igbo na azu ahia,ko ugbo na mbu. Ugbu a ndi Igbo bu cha dibia bekee,ndi nkuzi,ndi oka ikpe,ndi uwe ojii,ndi nto akuko,ndi na eme ihe ejije ma o bu egwuregwu onyonyo,na efe ugbo elu, na kwa olu ndi ozo.

Mana na agba ohuru anyi a,I ga ahu kwa na umu agbogho na umu okorobia anyi na emenye zi anyi ihe ihere.Umuaka ndi a abanyela otu ojoo na akuziri ha mpu.Ha so na ndi nto mmadu,ndi o ji egbe ezu,ndi na apunari mmadu ihe ha n’ike,ndi ji ugwu nwanyi ha akpata ego na imerime ihe ojoo ndi ozo na atachi nti.

Ndi Igbo bu kwanu ndi mba ndi ozo na atajiri anya maka ndu serere werere anyi.Ndi Igbo na e ji aka ha akpata ego ha site n’igba mbo mana umuaka ugbu a na achozi osiso osiso.O bu eziokwu a si na e me ngwa,emeghara odachi,kama o bughi n’nke a.Ihe nile nwere usoro na oge ya,usoro amaka.Nwata o bula tinye obi na uche ya n’igba mbo.o dighi ihe ga egbochi ya i ga n’ihu.Umuaka anyi eyirila anya ukwu na enweghi afo ojuju dika uwe.O dila oke mkpa na ndi nne na nna,ndi nkuzi,ndi ukochukwu na ndi nile kwesiri i kuziri umu anyi ihe ga enyocha onwe ma gbaa kwa mbo ihu na umuaka anyi mutara ezi ihe.

Ndi Igbo teta nu n’ura.A na m echeta Christy Essien Igbokwe (Ka Chineke nara mkpuru obi ya na ndokwa) na egwu ya,Teta nu n’ura.Ka anyi were nke a noria.Bikonu onye o bula jisie ike na oru.Anyi bu kwa nu ndi oma.Igbo Kwenu!

 

PS: A ka m na acho ka m ga esi tinye egwu ahu.M ga etinye ya mgbe o bula nwere ike. Udo !

Isi Okwu m

Igbo ndi oma ! A na me ekele ndi Igbo nile ndi na akwado ezi ihe,ndi na agba mbo,ndi Igbo ji biri!. Igboezuo bu mkpughe obi m!.O na anu m ezigbo oku na obi,i kwalite asusu na omenala ndi Igbo n’uzo o bula m nwere ike.Igboezuo bu otu uzo!.Ya mere,ebe a ga abu ogbako umu Igbo nile ,ndi ihe oma na adi mma,ndi na acho oganihu,udo,idi na otu na kwa ihunanya n’etiti ndi Igbo nile na agbanyeghi ebe anyi no,maka na anyi bu ndi Igbo na njem gbara akwukwo.

Igboezuo ga na akowa ma gosiputa kwa umu afo Igbo na emegba anyi ihu na mbo ha na agba na mpaghara uwa nile.A gaghi m ekwe gi nkwa,itapia Igbo ka onye nkuzi Igbo kama,a ga m anwa ike m mana ana m ariokwa unu ka anyi jiko aka onu, kwalite ala anyi. Onye bula jisie ike n’olu.

Igbo bu Igbo ekele m unu,kaa o,mma mma nu,ndewo nu,udo diri unu.Igbo amaka!